Acts 5:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu mgbe ahụ, onyeisi agha na ndị agha ya gara nꞌụlọ nsọ ahụ. Ha jidere ndị ozi ahụ kpụta ha nꞌihu nzukọ ndị na-achị achị ahụ. Ma ha ejighị ike mee nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume, ma ọ bụrụ na ha emesie ndị ozi ahụ ike.
Igbo 2006
Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwangwa, onyeisi agha na ndị agha ya gara nʼụlọnsọ ahụ jide ndị ozi ahụ ma kpụta ha, ma ha ejighị ike mee nke a nʼihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume.