Acts 5:28 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ọ bụ na m adọghị unu aka na ntị sị unu kwụsị izi onye ọ bụla ihe ọ bụla banyere aha a? Lee ihe unu mere ugbu a! Ozizi unu ejula Jerusalem! Unu chọkwara ka ndị mmadụ taa anyị ụta nꞌihi ọnwụ nwoke a!”
Igbo 2006
si, Ayi nyesiri unu iwu ike ka unu ghara izí ihe n'aha nka: ma le, unu ewerewo ozizí-unu meju Jerusalem, unu nēzube kwa iweta ọbara Nwoke a tukwasi ayi n'isi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
sị, “Ọ bụ anyị adọghị unu aka na ntị ka unu kwụsị ikuzi ihe nʼaha a; ma unu emeela ka ozizi unu jupụta Jerusalem niile kpebiekwa ime ka ọbara nwoke a dịrị anyị nʼisi.”