Acts 5:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Pita maara ihe Ananayas mere. Ọ sịrị ya, “Gịnị mere i ji kwenye ka ekwensu na-achị nꞌobi gị ime ka ị ghọgbuo Mmụọ Nsọ? Gịnị mere ekwensu ji mee ka i kwere izo ụfọdụ nꞌime ego i retara?
Igbo 2006
Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita sịrị, “Ananayas, gịnị mere ekwensu jiri jupụta obi gị mee ka ị ghaara mmụọ nsọ ụgha mgbe i zopuuru onwe gị ego site nʼime ego i retara nʼala gị?