Acts 5:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke ebuliela ya elu mee ya ka ọ nọdụ nꞌaka nri ya, ka ọ bụrụ Onyendu na Onye nzọpụta, iwetara Izirel nchegharị, na mgbaghara mmehie.
Igbo 2006
Onye ahu ka Chineke were aka-nri-Ya welie elu ibu Onye-ndú na Onye-nzọputa, inye Israel nchèghari na nb͕aghara nmehie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Chineke ebuliela ya elu nʼaka nri nke ya onwe ya dị ka Ọkpara eze na Onye nzọpụta, ka o nwee ike inye ndị Izrel niile nchegharị na mgbaghara mmehie.