Acts 5:36 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọ dịbeghị anya mgbe Teodas gosiri onwe ya kwuo na ọ bụ mmadụ pụrụ iche. Chetanụ na e gburu ya. Ndị nile na-eso ya ka e mere ka ha gbasasịa. Ihe nile banyere ya gwụsịrị.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e ubọchi nda akērughi Teudas biliri, nākpọ onwe-ya ihe; onye ọnu-ọgugu ndikom, ra ka nnù madu, dayere ya: onye eb͕uru; ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya, we b͕asa, ha we ghọ ihe-efu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge gara aga Teodas pụtara na-egosi na ya bụ onye pụrụ iche, ihe dịka narị mmadụ anọ sokwara ya, mgbe e gburu ya, ndị niile sooro ya gbasasịrị ihe niile a kwụsịkwa.