Acts 5:37 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Mgbe e mesịrị, Judas onye Galili gosikwara onwe ya nꞌoge a na-agụ mmadụ ọnụ sị na ọ bụ mmadụ dị mkpa na mmadụ dịkwa ukwuu. O nwetakwara ndị sooro ya, ma ya onwe ya lakwara nꞌiyi. Otu a kwa, ndị nile sooro ya gbasasịrị.
Igbo 2006
Mb͕e onye ahu gasiri Judas onye Galili biliri n'ubọchi odide-aha, me kwa ka ufọdu n'etiti ndi-Ju so ya n'azu: onye ahu la-kwa-ra n'iyì; ewe chusa ndi nile, ka ha ra, bú ndi kweyere ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe nke ya gasịrị, Judas onye Galili pụtakwara gosi onwe ya nʼoge a na-agụ ọnụọgụgụ mmadụ, o nwetakwara ndị sooro ya. Mgbe e gbukwara ya, ndị niile na-eso ya gbasasịrị.