Acts 5:38 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ya mere, nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu taa. Hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, mgbe na-adịghị anya ọ ga-emebi.
Igbo 2006
M'si kwa unu ub͕u a, Wepunu aka n'aru madu ndia, rapu-kwa-nu ha: n'ihi na ọ buru na ìzù a ma-ọbu ọlu a sitere n'aka madu agākwatu ya n'ala:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, agwa m unu, hapụnụ ndị a ka ha laara onwe ha. Nʼihi na ọ bụrụ na ọrụ ha bụ ọrụ mmadụ, ọ ga-akwụsị mgbe na-adịghị anya.