Acts 5:39 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụkwanụ na ọrụ ha bụ ọrụ Chineke, bụrụkwa nke ha na-arụ dị ka nzube ya si dị, unu enweghị ike ịkwatụ ya, ma ọ bụ ịkwụsị ya. Ọ bụrụ ọrụ Chineke ka unu na-agbalị ịkwụsị, unu ga-achọpụta na unu na-edo onwe unu imegide Chineke.”
Igbo 2006
ma ọ buru na o sitere n'aka Chineke, unu agaghi-apu ikwatu ha n'ala; ka aghara ihu unu dika ndi nālu kwa ọ̀gù megide Chineke ma eleghi anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na o sitere nʼaka Chineke, unu agaghị enwe ike ịkwụsị ndị ikom ndị a, unu ga-achọpụta naanị na unu na-alụso Chineke ọgụ.”