Acts 5:4 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe a na-erebeghị ala ahụ, ala ahụ ọ̀ bụ nke onye? Ọ bụghị nke gị? Mgbe i rere ya ego i retara ọ̀ bụkwaghị nke gị, iji mee ihe ị chọrọ? Gịnị mere i ji mee ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghọgburu, ọ bụ Chineke ka ị ghọrọ aghụghọ.”
Igbo 2006
Mb͕e ọ nānọ, ọ̀ nọgideghi n'aka-gi? mb͕e eresiri ya, ọ̀ dighi kwa n'ike-gi? Gini mere i ji tiye ihe a n'obi-gi? Ọ bughi madu ka i gwara okwu-ugha, kama ọ bu Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụghị gị nwe ala ahụ tupu e ree ya? Mgbe e rechara ya, ego e retara ya ọ bụghị nke gị, iji mee ka ị chọrọ? Gịnị mere i ji chee echiche ime ihe dị otu a? Ọ bụghị mmadụ ka ị ghaara ụgha kama ọ bụ Chineke.”