Acts 6:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge ahụ, mgbe ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-aba ụba, esemokwu dapụtara nꞌetiti ndị kwere ekwe na-asụ asụsụ Griik na ụmụnna ha ndị Juu. Esomokwu a dapụtara nꞌihi na ụfọdụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ adịghị eketa nri kwesịrị ịbụ nke ha oge nile a na-eke ya.
Igbo 2006
Ma na mb͕e ahu, mb͕e ndi nēso uzọ Jisus nāba uba, ndi-Ju nāsu asusu Grik malitere itamu megide ndi-Hibru, n'ihi na elefuru ndinyom-ha ndi di-ha nwuru anya n'ije-ozi, bú ikère ndi Kraist òkè, kwa-ubọchi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼoge ahụ mgbe ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya bidoro ịmụba, ndị Juu na-asụ asụsụ Griik mere mkpesa megide ndị Juu na-asụ asụsụ Hibru nʼihi na a na-elefuru ndị inyom ha, ndị di ha nwụrụ anwụ anya na nri a na-eke kwa ụbọchị.