Acts 6:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Okwu Chineke gbasara. Ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe bakwara ụba. Nꞌoge a ọtụtụ ndị nchụaja nabatara Jisọs Kraịst.
Igbo 2006
Okwu Chineke we nāga n'iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Okwu Chineke gbasara nnọọ. Ọnụọgụgụ ndị na-eso ụzọ ya na Jerusalem bakwara ụba. Nʼoge a, ọtụtụ ndị nchụaja nabatara na-erubekwa isi nʼokwukwe.