Acts 7:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mosisi a m na-ekwu ihe banyere ya bụ otu Mosisi ahụ ụmụnna ya jụrụ nꞌala Ijipti. Ee, ọ bụ otu Mosisi ahụ ha jụrụ ajụjụ sị, ‘Ònye mere gị onyeisi na onye ikpe nꞌebe anyị nọ?’ Ọ bụkwa Mosisi a ka Chineke zigara ịzọpụta na ịchị ndị ya. Chineke nyekwara Mosisi ike ime nke a site nꞌọnụ mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nꞌime ọkụ ahụ na-enwụ nꞌosisi ahụ dị nꞌọzara.
Igbo 2006
Moses nka, onye ha juru aju, si, Onye mere gi ka i buru onye-isi na ikpé? onye a ka Chineke ziteworo ibu onye-isi, ibu kwa onye-nb͕aputa, ya na aka mọ-ozi ahu nke emere ka ọ hu ya n'osisi ntà ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ bụ otu Mosis ahụ ha jụrụ ajụ, mgbe ha sịrị, ‘Onye mere gị onyeisi na onye ikpe?’ Ọ bụkwa ya ka Chineke zigara ị bụ onyeisi na onye nnapụta ha, site nʼinyeaka mmụọ ozi ahụ mere ka ọ hụ ya nʼọhịa ahụ.