Acts 7:36 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mosisi a sitere nꞌala Ijipti kpọpụta ha. Tupuu ọ kpọpụta ha ọ rụrụ ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya nꞌala Ijipti. Mgbe ọ hapụrụ Ijipti ọ rụkwara ọrụ ebube nꞌosimiri uhie na nꞌime ọzara.
Igbo 2006
Nwoke a duputara ha, mb͕e ọ lusiri ọlu-ebube di iche iche na ihe-iriba-ama di iche iche n'Ijipt, na nime Oké Osimiri Uhie, na nime ọhia ọgu arọ abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O duuru ha pụta mgbe ọ rụsịrị ọrụ ebube na ihe ịrịbama dị iche iche nʼala Ijipt, na nʼOsimiri Uhie na nʼọzara iri afọ anọ.