Acts 7:40 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi ya, ha gwara Erọọn sị, ‘Meere anyị chi ọzọ, nke ga-edu anyị, nꞌihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosisi, onye sitere nꞌala Ijipti dupụta anyị.’
Igbo 2006
nāsi Eron, Mere ayi chi ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, onye duputara ayi n'ala Ijipt, ayi amataghi ihe mere ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
na-asị Erọn, ‘Meere anyị chi, ndị nke ga-edu anyị, nʼihi na anyị amaghị ihe mere nwoke a bụ Mosis, onye sitere nʼala Ijipt dupụta anyị.’