Acts 7:42 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Nꞌihi nke a Chineke chepụrụ ihu ya site nꞌebe ha nọ, gbaketa ha azụ. Ọ hapụrụ ha ka ha fee kpakpando na anwụ na ọnwa. Nꞌakwụkwọ Emos onye amụma, Chineke na-ajụ ajụjụ sị, ‘Ụlọ Izirel, unu chụrụ aja jirikwa anụ e gburu egbu nye onyinye nꞌọzara iri afọ anọ. Ọ̀ bụ m ka unu chụụrụ aja ahụ?
Igbo 2006
Ma Chineke chighariri, we rara ha nye ikpere usu ihe di n'elu-igwe; dika edeworo ya n'akwukwọ ndi-amuma, si, Ọ̀ di anu eb͕uru eb͕u na àjà unu wetaram Ọ̀gu arọ abua n'ọhia, unu ulo Israel?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Chineke chepuru ihu ya site nʼebe ha nọ. Ọ rara ha nye ikpere usuu ihe dị nʼeluigwe. Nke a dabara nʼihe e dere nʼakwụkwọ ndị amụma, “ ‘Unu ụlọ Izrel, unu o wetara m onyinye anụ e gburu egbu ka ọ dị aja unu chụụrụ m iri afọ anọ unu nọrọ nʼọzara?