Acts 7:43 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
É,è, obi unu dịrịị nꞌarụsị unu. Unu na-eche ihe banyere Molok na Refan, bụ chi kpakpando. Echiche unu dị na chi ahụ unu kpụrụ. Nꞌihi nke a, aga m esite nꞌala a wezụga unu, burukwa unu gafee obodo Babilọn.’
Igbo 2006
Unu we palie ulo-ikwū nke Mọlọk, Na kpakpando nke chi ahu, bú Refan, Ihe-atù unu mere ikpọ isi ala nye ha: M'gēme kwa ka unu je biri n'ofè Babilon.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu buliri ụlọ ikwu nke Mọlọk na kpakpando nke chi unu bụ Refan, bụ arụsị ndị ahụ unu mere ịkpọ isiala nye ha. Ya mere, aga m ewezuga unu, burukwa unu gaa nʼofe obodo Babilọn.’