Acts 7:49 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Chineke kwuru sị, ‘Eluigwe bụ ebe ocheeze m dị. Ụwa bụkwa ebe izuike nye ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewu? M ga-ebi nꞌime ya? Ana m achọ ebe m ga-anọ zuo ike?
Igbo 2006
Elu-igwe bu oche-ezem, Uwa bu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu nke ukwum abua: Àha ulo gini ka unu gēwurum? ka Onye-nwe-ayi kwuru: Ma-ọbu gini bu ebe izu-ikem?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“ ‘Eluigwe bụ ocheeze m. Ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewuru m? Maọbụ ebee ka ebe izuike m ga-adị? Ka Onyenwe anyị kwuru.