Acts 7:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌoge ahụ, Chineke enyeghị ya òke ọ bụla nꞌala a. Chineke enyeghị ya ọ bụladị otu nzọ ụkwụ ka ọ bụrụ nke ya. Ma Chineke kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya ala a. Chineke kwekwara nkwa na ụmụ ụmụ ya ga-eketa ala a. Ma nꞌoge ahụ Chineke kwere Eberaham nkwa a, Eberaham enweghị nwa ọ bụla.
Igbo 2006
ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nyeghị ya ihe nketa nʼebe a, ọ bụladị ihe ruru otu nzọ ụkwụ. Ma o kwere ya nkwa na ọ ga-enye ya na ụmụ ụmụ ya ala ahụ ka ọ bụrụ nke ha, nʼagbanyeghị na ọ mụtaghị nwa.