Acts 7:52 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Kpọọ onye amụma ahụ aha nke nna nna unu na-akpagbughị! Ha gburu ndị ahụ buru amụma banayere ọbịbịa onye ezi omume ahụ, bụ Onye nzọpụta ahụ unu raara nye, onye e gbukwara.
Igbo 2006
Onye nime ndi-amuma ka nna-unu-hà nēsob͕ughi? ha we b͕ue ndi buru uzọ kwusa okwu bayere ọbibia nke Onye ezi omume ahu; Onye unu onwe-unu ghọrọ ub͕u a ndi rara Ya nye na ndi b͕uru Ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dị onye amụma ndị nna unu ha na-akpọgbughị? Ha gburu ọ bụladị ndị buru amụma banyere ọbịbịa nke onye ezi omume ahụ, ma ugbu a unu bụ ndị raara ya nye ma gbukwaa ya.