Acts 7:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Chineke mere ka ọgbụgba ndụ obibi ugwu dịrị nꞌetiti ya na Eberaham. Ọ bụ nꞌokpuru ọgbụgba ndụ ahụ ka Eberaham mụrụ Aizik. Aizik mụtara Jekọb. Ọ bụkwa ụmụ nke Jekọb mụtara bụ ndị isi ebo iri na abụọ nke Izirel.
Igbo 2006
O we nye ya ọb͕ub͕a-ndu nke obibì-úgwù: otú a Abraham we mua Aisak, we bì ya úgwù n'ubọchi nke-asatọ; Aisak we mua Jekob, Jekob we mua nna uku ayi iri na abua.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O nyere ya ọgbụgba ndụ nke obibi ugwu. Ebraham mụrụ Aịzik bie ya ugwu nʼụbọchị nke asatọ. Aịzik amụta Jekọb, Jekọb amụta ndịisi ebo iri na abụọ nke Izrel.