Acts 8:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Sọl kwenyere ka e gbuo Stivin. Nꞌụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ Kraịst dị na Jerusalem. Mkpagbu a mere ka ndị kwere ekwe site na Jerusalem gbapụ. Ha gbaara ọsọ gbaga obodo ndị ọzọ dị iche iche dị na Judia na Sameria. Ọ bụkwa nanị ndị ozi Kraịst fọdụrụ na Jerusalem.
Igbo 2006
Ma ob͕ub͕u-ya di Sọl ezi nma. Oké nsob͕u we puta n'ubọchi ahu megide nzukọ Kraist di na Jerusalem; ha nile we b͕asasia n'ala Judia na Sameria dum, ma-ọbughi ndi-ozi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Sọl kwenyere ka e gbuo ya. Nʼụbọchị ahụ, oke mkpagbu bidoro megide nzukọ dị na Jerusalem. Ndị niile kwere ekwe, ma ewezuga ndị ozi nʼonwe ha gbasasịrị nʼala Judịa na Sameria.