Acts 8:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma mgbe Filip kwusasịrị ozi ọma, ha kweere na Jisọs, na ọ bụ Onye nzọpụta. Ha kwekwara ihe nile Filip kwuru banyere alaeze Chineke. E mere ọtụtụ nꞌime ha baptizim, nwoke na nwanyị ha.
Igbo 2006
Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma mgbe ha kwenyere nʼoziọma Filip dịka ọ na-ekwusa ihe banyere oziọma alaeze Chineke na aha Jisọs Kraịst, e mere ha baptizim, ma nwoke ma nwanyị ha.