Acts 8:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na site nꞌọrụ ebube ndị a, mmụọ ọjọọ pụrụ site na ndụ ndị ụfọdụ. Mmụọ ọjọọ a pụtara na-eti mkpu. Ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ ka Filip gwọkwara. Ụfọdụ ndị ngwụrọ ka ọ gwọkwara.
Igbo 2006
N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha ji iti mkpu site nʼime ọtụtụ mmadụ pụta. Ọ gwọkwara ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ na ndị ngwụrọ.