Acts 8:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma o nwere otu nwoke bi nꞌobodo ahụ a na-akpọ Saimọn. Tupuu Filip abịa, Saimọn na-arụ ọrụ ịtụnanya dị iche iche site nꞌike ọgwụ e kere eke. Nꞌihi ihe ndị a ọ na-eme, ọ na-akpọ onwe ya mmadụ dị mkpa.
Igbo 2006
Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, kemgbe ọtụtụ oge gara aga, otu nwoke aha ya bụ Saimọn bụ onye mgbaasị. O jirila mgbaasị ya mee ọtụtụ ihe tụrụ ndị niile bi nʼobodo Sameria nʼanya. Ọ na-anyakwa isi na ya bụ onye dị ukwu.