Acts 9:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Na Damaskọs ahụ, otu onye kwere ekwe nọ ya. Aha ya bụ Ananayas. Ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ a, Onyenwe anyị kpọrọ ya oku sị, “Ananayas!” Ọ zara sị, “Anọ m nꞌebe a, Onyenwe anyị.”
Igbo 2006
Ma otù onye nke nēso uzọ Jisus nọ na Damaskọs, aha-ya bu Ananaias; Onye-nwe-ayi we si ya n'ọhù, Ananaias. O we si, Le, mu onwem, Onye-nwe-ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nke na-eso ụzọ ya nọ na Damaskọs, a na-akpọ Ananayas. Onyenwe anyị gwara ya nʼọhụ, “Ananayas!” Ọ sịrị, “Lee m, Onyenwe anyị.”