Acts 9:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ananayas gara hụ Sọl dị ka Chineke nyere ya iwu. Ọ chọtakwara Sọl, bikwasị ya aka, gwa ya okwu sị ya, “Nwanna m Sọl, Onyenwe anyị Jisọs onye gosiri gị onwe ya nꞌụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ma jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”
Igbo 2006
Ananaias we je, ba n'ulo ahu; o we bikwasi ya aka-ya abua n'isi, si, Sọl, nwa-nnam, Onye-nwe-ayi, bú Jisus, Onye mere ka i hu Ya n'uzọ i si bia, ezitewom, ka ewe me ka i hu uzọ, ka i we juputa kwa na Mọ Nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, Ananayas garuru nʼụlọ ahụ, banyekwa nʼime ya. Ọ bikwasịrị aka ya nʼisi Sọl, sị, “Nwanna Sọl, Onyenwe anyị Jisọs, onye gosiri gị onwe ya nʼụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ka ị jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”