Acts 9:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ rịọrọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs. Akwụkwọ ozi a bụ ka nzukọ ndị a nyere Sọl aka ịkpagbu ndị kwere ekwe ọ bụla ọ chọpụtara nꞌebe ahụ, nwoke na nwanyị, ka o kee ha agbụ, kpụta ha na Jerusalem dị ka ndị mkpọrọ.
Igbo 2006
riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
rịọ ya ka o nye ya akwụkwọ ozi nke ọ ga-eji jekwuru ndị ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Damaskọs, nke ọ ga-abụ ọ hụ onye ọbụla na-eso Ụzọ ahụ ma ha bụ nwoke ma ha bụ nwanyị, ka ọdọkpụrụ ha nʼagbụ, kpụgaa Jerusalem.