Acts 9:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O juru ndị nile nụrụ okwu ya anya. Nꞌihi ya ha na-asị, “Nwoke a ọ̀ bụghị onye ahụ kpagburu ndị kwere ekwe na Jerusalem? Ọ bịakwaghị Damaskọs ijide ndị nile kwere ekwe, ịkpụgara ha ndị isi nchụaja nọ na Jerusalem?”
Igbo 2006
Ibobo we nwua ndi nile nuru ya n'aru, ha nāsi, Ọ̀ bughi onye a bu onye mebiri nime Jerusalem ndi nākpọku aha nka? ọ bia-kwa-rari n'ebe a ime ihe a, bú, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u je n'iru ndi-isi-nchu-àjà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O juru ndị niile nụrụ ya anya, ha na asị, “Ọ bụghị nwoke a bụ onye ahụ na-emekpa ndị niile na-akpọku aha ahụ na Jerusalem? Ọ bụ na ọ bụghị maka nke a ka o ji bịa ebe a ịkpụrụkwa ha kpụgara ndịisi nchụaja?”