Acts 9:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Sọl akwụsịghị ikwusa ozi ọma! Kama ike ikwusa ozi ọma ya na-aba ụba. Ọ gara nꞌihu imeri ndị Juu site nꞌụzọ o siri gosi ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.
Igbo 2006
Ma emere Sọl ka o nwe kari ike, ọ nēkwu kwa okwu nke b͕ara ndi-Ju bi na Damaskọs ghari, ebe ọ nēgosi nke-ọma na Onye a bu Kraist-ha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Sọl gara nʼihu baa ụba nʼike karịa na ikwu okwu nke gbara ndị Juu bi nʼobodo Damaskọs gharịị site nʼụzọ o siri gosi na Jisọs bụ Kraịst ahụ.