Acts 9:24 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ nile e si apụ obodo ahụ, ka ha gbuo ya.
Igbo 2006
ma emere ka Sọl mara ajọ ìzù-ha. Ha we nēche kwa ọnu-uzọ-ama nile ehihie na abali ka ha we b͕ue ya:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Sọl chọpụtara ihe ha zubere ime. Ehihie na abalị, ndị a nọ na-eche ụzọ niile e si apụ nʼobodo ahụ nche, ka ha nwe ike gbuo ya.