Acts 9:3 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Sọl na-aga nꞌụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ìhè chakarịrị ìhè nke anyanwụ siri nꞌelu chaa ya gburugburu.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ nāga, o rue na ọ nābiaru Damaskọs nso: na mberede ìhè si n'elu-igwe b͕uru ya àmùmà buruburu:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ na-aga nʼụzọ, ọ bịaruru ebe dị Damaskọs nso. Na mberede, ihe ìhè nke sitere nʼeluigwe chara ya gburugburu.