Acts 9:38 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị kwere ekwe nụrụ na Pita nọ na Lida, ha ziri ozi ka a kpọọ ya. Ụmụ nwoke abụọ gara ịgwa ya sị, “Atufula oge ịbịakwute anyị.”
Igbo 2006
Ma ebe Lida di Jọpa nso, ndi nēso uzọ Jisus, ebe ha nuru na Pita nọ n'ebe ahu, ha zigara ya ndikom abua, nāriọ ya, si, Alala azu ibiakute ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jopa dịkwa nso na Lida. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ na Pita nọ nʼebe ahụ, ha ziri ụmụ nwoke abụọ ozi ka a rịọọ ya, sị, “Biko, ahapụla ịbịakwute anyị ngwangwa.”