Acts 9:39 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Pita sooro mmadụ abụọ ahụ gaa ngwangwa. Mgbe o ruru Jopa, ha duuru ya gaa nꞌụlọ ebe ha nyibere ozu Dọkas. Ụmụ nwanyị nile di ha nwụrụ nọ nꞌebe ahụ na-akwa akwa. Ha gosiri Pita uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.
Igbo 2006
Pita we bilie so ha je. Ma mb͕e ọ biaruru, ha duru ya rigo n'ime-ulo ahu di n'elu ulo: ndinyom nile ndi di-ha nwuru guzo-kwa-ra ya nso nākwa ákwá, nēgosi kwa uwe-ime na uwe ọzọ, ka ha ra, bú nke Dọkas nēme mb͕e ya na ha nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita biliri soro ha gawa, mgbe o ruru, ha duuru ya gbago nʼụlọ elu nʼime ụlọ ahụ. Ụmụ nwanyị niile di ha nwụrụ anwụ nọ nʼebe ahụ na-ebe akwa, na-egosi uwe Dọkas dụụrụ ha mgbe ọ dị ndụ.