Acts 9:40 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Pita gwara mmadụ nile ka ha pụọ nꞌụlọ ahụ. O gburu ikpere nꞌala kpee ekpere. Mgbe o kpesịrị, o chere ihu ya nꞌebe ozu nwanyị ahụ dina kwuo okwu sị, “Dọkas, bilie!” Nwanyị ahụ nwụrụ anwụ meghere anya ya. Mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri ọtọ, nọdụ ala.
Igbo 2006
Ma Pita chupuru ha nile n'èzí, we b͕ue ikperè n'ala, kpe ekpere; o we chigharia n'ebe ozu ahu di, si, Tabita, bilie. Nwanyi ahu we saghe anya-ya; mb͕e ọ huru Pita, o we nọlie.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Pita chụpụrụ ha niile nʼezi, gbuo ikpere nʼala, kpee ekpere. Ọ tụgharịrị chee ozu ahụ ihu sị, “Tabita, bilie.” O meghere anya ya, ma mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri, nọdụ ala.