Amos 1:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m egbu ndị Ashdọd, ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn. Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn, ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị.