Amos 3:15 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
M'gēti kwa ma ulo mb͕e oyi ma ulo mb͕e okpom-ọku ihe; ulo nile nke ejiri ọdu wu gāla kwa n'iyì, ọtutu ulo gāgwusi kwa; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Aga m etida ụlọ ndị niile ha wuru maka oge oyi, na nke ha wuru maka oge okpomọkụ; aga m ebibikwa ụlọ ndị ahụ niile ha ji ọdụ enyi wuo. Ọtụtụ ebe obibi ha niile ka a ga-etitukwa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.