Amos 4:10 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ezitere m nʼetiti unu ajọ ọrịa na-efe efe dịka ndị ahụ m zitere ndị Ijipt. Ejiri m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu, mee ka a dọta ịnyịnya agha unu nʼagha. Emere m ka isisi ọjọọ ndị niile nwuru nʼọmụma ụlọ ikwu unu jupụta imi unu, ma nke a emeghị ka unu lọghachikwute m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.