Amos 7:12 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Amazaia we si Emos, Gi onye-ọhu-uzọ, je b͕alaga n'ala Juda, rie nri n'ebe ahu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka i gēbu amuma:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ahụ, Amazaya gwara Emọs, “Gị onye ọhụ ụzọ, gbara ọsọ gbalaa ala Juda. Jee nʼebe ahụ, rie achịcha nke sitere nʼibu amụma gị, nọrọkwa nʼebe ahụ buo amụma gị.