Amos 7:8 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
Jehova we sim, Gini ka gi onwe-gi nāhu, Emos? M'we si, Opù eji atù mb͕idi; Onye-nwe-ayi we si, Le, M'gaje ido opù eji atù nb͕idi n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-agabiga kwa nmehie-ha ọzọ:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Onyenwe anyị sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ihe ịtụ mgbidi.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kwuru, “Lee, mụ onwe m na-edo ihe ịtụ mgbidi nʼetiti ndị m bụ Izrel, agaghịkwa m esi ebe ha nọ gafee.