Amos 7:9 — Compare Translations
2 translations compared side by side
Igbo 2006
ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n'efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M'gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ebe niile e wuliri elu nke Aịzik aghaghị ịbụ ebe e mebiri emebi, ebe nsọ niile nke Izrel aghaghị ịbụ ebe tọgbọrọ nʼefu, aghakwaghị m iweli mma agha m elu iji megide ụlọ Jeroboam.”