Colossians 1:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị akwụkwọ a. Ndị ahụ bụ ụmụnna anyị nꞌime Kraịst site nꞌokwukwe ha. Ka Chineke Nna anyị nye unu amara ya na udo ya.
Igbo 2006
nēdegara ndi nọ na Kọlọsi akwukwọ, bú umu-nna-ayi nime Kraist ndi di nsọ kwe-kwa-ra ekwe: Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, puta.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị, bụ ụmụnna ndị dị nsọ na ndị kwesiri ntụkwasị obi. Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị dịrị unu.