Colossians 1:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ site nꞌihe Ọkpara ya mere ka Chineke ji kpebie ka ụwa nile bịaghachikwute ya. Nꞌihi na site nꞌọnwụ nke Kraịst nwụrụ nꞌelu obe, na ọbara ọ wụsịrị, e meela ka udo dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ nile. Ihe nile dị nꞌụwa na nꞌeluigwe nwekwara ike ịbịakwute Chineke ugbu a.
Igbo 2006
ka O we site kwa n'aka-Ya me ka Ya onwe-ya na ihe nile di n'otù, ebe O sitesiri n'ọbara nke obe-Ya me ka Ya onwe-ya na madu di n'udo; site n'aka-Ya, ka m'kwuru, ma ọ bu ihe di n'elu uwa, ma-ọbu ihe di n'elu-igwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ site na ya ka o ji mee ka ihe niile bịaghachikwute ya. E mere ka udo dịrị nʼetiti ya na ihe niile, maọbụ ihe dị nʼụwa, maọbụ nke dị na nʼeluigwe site na ọbara ọ wụsiri nʼelu obe.