Colossians 1:21 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a metụtakwara unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-anọghị Chineke nso na mbụ. Mgbe ahụ unu bụ ndị iro ya, ndị mmehie ha na echiche ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha, mere ka Chineke dị anya nꞌebe unu nọ. Ma ugbu a, ọ kpọbatala unu dị ka ndị enyi ya.
Igbo 2006
Unu onwe-unu kwa, ọ bu ezie na emereri unu ka unu buru ndi ala ọzọ n'oge gara aga, buru kwa ndi-iro n'èchìchè-uche-unu nime ajọ ọlu nile unu, ma ub͕u a ka O mere ka unu na Ya di n'otù
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu onwe unu bụ ndị e mere ndị mba ọzọ site nʼebe Chineke nọ, na ndị iro nʼuche unu nʼihi ajọ omume niile unu.