Colossians 1:22 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Chineke mere nke a site nꞌọnwụ nke Ọkpara ya nwụrụ nꞌelu obe, nke mere ka unu bụrụ ndị enyi ya, ndị a kpọbatara nꞌihu ya, ndị guzokwa nꞌihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị dị ọcha, ndị na-enweghị ntụpọ ọ bụla.
Igbo 2006
nime aru nke anu-aru-Ya, site n'ọnwu-Ya, iche unu n'iru Ya dika ndi di nsọ, ndi anāpughi kwa ita uta, ndi anāpughi kwa ibo ebubo:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, o kpezierela unu site na-anụ ahụ Kraịst, sitekwa nʼọnwụ ya, iji chee unu nʼihu ya dịka ndị dị nsọ, na ndị na-enweghị ịta ụta, na ihe ebubo ọbụla megide ha.