Colossians 1:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ihe ọzọ Chineke chọrọ nꞌaka unu bụ ka unu nọgide bụrụ ndị guzosiri ike nꞌihe unu kwenyere, na ndị guzosiri ike nꞌime Onyenwe anyị, ndị ozi ọma ahụ doro anya nke ọma. Ozi ọma ahụ nke kwuru na Jisọs nwụrụ nꞌihi unu. Hụnụ na unu esiteghị nꞌozi ọma a wezuga onwe unu, ma ọ bụ kwụsị ịtụkwasị ya obi ịzọpụta unu. Nke a bụ ozi ọma ahụ e wetaaara unu nke a na-ezisakwa nꞌụwa nile. Mụ onwe m bụ Pọl, jikwa ọṅụ na-agwa ya ndị ọzọ.
Igbo 2006
ma asi na ọ bu ezie na unu anọgide n'okwukwe-unu, ndi atọworo ntọ-ala, ndi nēguzosi kwa ike, ndi anādighi-ewepu kwa n'olile-anya nke ozi ọma ahu nke unu nuru, nke ekwusara n'etiti ihe nile ekère èkè nke di n'okpuru elu-igwe; nke emere mu onwem, bú Pọl, onye nēje ozi ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na unu anọgide nʼokwukwe unu, bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ, ndị guzosiri ike, ndị na-ewezugaghị onwe ha site nʼolileanya ahụ dịrị unu nʼoziọma ahụ. Nke a bụ oziọma ahụ unu nụrụ, nke ekwusakwara nye ihe niile e kere eke nʼokpuru eluigwe, nke e mere mụ onwe m bụ Pọl, onyeozi ya.