Colossians 1:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ozi ọma ahụ e kwusaara unu bụkwa otu ozi ọma ahụ a na-agbasa nꞌụwa nile, nke na-eweta mgbanwe na ndụ ndị nụrụ ya, dị ka o si wetara unu mgbanwe mgbe unu nụrụ ya, ghọtakwa ụdị obi ebere Chineke nwere nꞌebe ndị mmehie nọ.
Igbo 2006
nke biaruru unu; dika ọ nāmiju kwa nkpuru n'uwa nile, nāba kwa uba, dika ọ nēme kwa n'etiti unu, site n'ubọchi unu nuru mazu kwa amara Chineke n'ezi-okwu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
nke bịaruterela unu. Nʼezie, dị ka o si dị nʼụwa niile, ọ na-amị mkpụrụ na-etokwa, dị ka o si eme nʼetiti unu, site nʼụbọchị unu nụrụ ma ghọtakwa amara nke Chineke nʼeziokwu.