Colossians 1:7 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ Epafras onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ, onye anyị hụkwara nꞌanya, wetaara unu ozi ọma a. Epafras bụ odibo Kraịst, onye nọ ugbu a na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ unu.
Igbo 2006
dika unu mutara n'ọnu Epafras orù-ibe-ayi onye ayi huru n'anya, onye bu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ijere Kraist ozi n'ọnọdu ayi,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Dị ka unu siri mụta nʼaka Epafras, onye anyị hụrụ nʼanya na onye anyị na ya na-ejekọ ozi. Ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nʼijere Kraịst ozi nʼaha unu.