Colossians 2:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ahụ, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi mmehie, mgbe ahụ kwa, unu bụ ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu na-achị ndụ ha, ma Chineke mere ka unu soro Kraịst keta ndụ ọhụrụ, nꞌihi na ọ gbaghaara unu mmehie unu nile.
Igbo 2006
Unu onwe-unu kwa, mb͕e unu nọ n'ọnwu site na ndahie nile unu na ebìghi-úgwù nke anu-aru-unu, ọbuná unu ka O mere ka unu so Ya dikọ ndu, mb͕e O weresiri amara b͕aghara ayi ndahie-ayi nile;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe unu bụ ndị nwụrụ anwụ nʼime mmehie unu, na nʼime ebighị ugwu nke anụ ahụ mmehie unu, Chineke mere ka unu soro Kraịst dịrị ndụ ọzọ. Ọ gbaghara anyị mmehie anyị niile,