Colossians 2:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
O hichapụrụ ụgwọ mmehie nile unu ji, ụgwọ iwu ahụ nile unu na-edebeghị. O weere mmehie ndị a nile laa ha nꞌiyi, site nꞌịkpọgide ya nꞌelu obe Kraịst.
Igbo 2006
mb͕e O hichapusi-kwa-ra ihe ayi ji aka-ayi de n'akwukwọ ike onwe-ayi ab͕u, nke megidere ayi, bú ihe edere n'iwu nke enyere ayi, nke nēguzogide ayi: O wepuwo kwa ya n'etiti ayi na Ya, nākpọgide ya n'obe-Ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
kagbuo iwu niile e dere ede, ya na usoro ya niile nke guzoro imegide anyị. O wezugara ha, kpọgide ha nʼobe.