Colossians 2:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌelu obe ahụ, Chineke napụrụ ekwensu ike o ji ebo unu ebubo mmehie. O mekwara ka mmeri Kraịst meriri ekwensu nꞌelu obe ahụ e si wezuga mmehie unu, pụta ìhè nye mmadụ nile.
Igbo 2006
mb͕e O yipuchasiri n'aru ibu-ndi-isi nile na ichi-isi nile ihe-agha-ha nye Onwe-ya, O were nkwuwa-okwu gosi ha n'iru ọra, nēdughari ha n'ọṅù-agha n'elu obe-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ napụrụ ike niile, na ịchị isi niile, ngwa agha ha niile, ọ gbara ha ọtọ nʼihu ọha, igosi mmeri o meriri ha nʼobe.